Hosea 14

Nchegharị na ngọzị

1Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel;
nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ.
2Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu
lọghachikwute Onyenwe anyị.
Gwanụ ya sị,
“Gbaghara mmehie anyị niile,
jirikwa ihuọma nabata anyị,
ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja.
3Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị,
ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị.
Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’
nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa,
nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.”

4“Aga m agwọ ndaghachi azụ ha,
jiri obi m niile hụ ha nʼanya,
nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa.
5Aga m adịrị Izrel dịka igirigi.
Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili.
Dịka osisi sida nke Lebanọn,
mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala;
6ome ya ga-awasa,
ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv,
isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn.
7Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m.
Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ.
Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị,
a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn.
8Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ?
Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya.
Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ.
Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.”

9Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a.
Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara.
Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ.
Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha,
ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.
Copyright information for IboBIU